UNIT 22 Isi nke iri na itolu NA Ụlọ ọgwụ.(IN THE Hospital)

Objective
Ihe mmuta (Objectives) After working your way through this chapter, you must be able to : 1. Identify the names of some common diseases. 2. Orally discuss the causes, symptoms and prevention of some common diseases. 3.Write a dialogue between a pati
Introduction

Among the Igbos, when someone is sick, it also literally affects his relatives. That is why it is said that sickness is not only a physical occurrence but also a social fact. Individuals who do not show concern for a sick friend or relative are usually seen as being bad. Sometimes relatives pull resources together to help a sick relative seek medical treatment. In the rural areas, where most people have limited access to hospitals, they rely heavily on traditional medicine for their health needs. Some people in the urban areas still consider traditional treatment as the first option when they are sick. It is not uncommon for people to combine the two systems of healing when they are sick. Others resort to religious sects for healing

Lesson Vocabulary

Lesson Vocabulary

Ahụ ike Health
Mkpụrụ ọgwụ Tablets
ọgwụ Medicine
ọgwụ bekee Scientific medicine
ọgwụ mkpa akwụkwọ Traditional medicine
ọgwụ mmiri Liquid medicine
Okwu dị mkpa Useful expression
Onye ọgwọ orịa/dokita Doctor
Onye ọrịa Patient/ill person
Onye uwe ọcha Nurse
Ọrịa Sickness/illness
ọrịa na efe efe Infectious disease
ọrịa si na ikuku Airborne disease
ọrịa si na mmiri Waterborne disease
ụlọ ebe a na ere ọgwụ Pharmacy
Ụlọ ọgwụ Hospital

Lesson Conversation:

Lesson Monologue

Read the monologue below about Ịbụchim describing her sickness to her doctor.

Ahụ adịghị m. isi na awa m, afọ na asa m, ahụ m nile na egbu m mgbu. M ribeghi nri kamgbe ụnyahụ. O bidoro abali atọ gara aga. O mere ka ike na agwụ m nnukwu. A maghị m ihe m ga eme mana m ṅụrụ parasitamol abali gara aga na ụtụtụ tata. Ọ bụ sọọsọ mmiri ka m na aṅụ. A maghị m ihe bidoro ahụ mgbu a. Biko nyere m aka dọkịta.

Translate

Dialogue:(Amara goes to the hospital to see a doctor. Listen to their conversation)

Amara: ndewo, dọkịta. Dokịta: ndewo. Kedụ ihe m ga emere gị? Amara: Ahụ adịghị m Dọkịta: Kedụ ihe na eme gị? Amara: m na anyụ anyụ na agbọ agbọ. Dọkịta : Kedụ mgbe o bidoro? Amara: o bidoro ụnyahụ. Dọkịta: Ahụ gi ọ na egbu gi mgbu? Amara: Eeeee. Ọkachasị akụkụ afọ m nile. Ahụ ọkụ na eme m. Dọkịta: Kita, m ga ele gi ahụ iji chọpụta ihe na enye gi nsogbu. Site na ihe m hụrụ, m Che na i nwe nje afọ. ọtụtụ mmadụ na enweta nje afọ site na unyi nke Bara ha na afọ. Amara: Kedụ ihe m ga eme ka ahụ dị m mma? Dọkịta: m ga enye gi mkpụrụ ọgwụ maka ya. ị ga agba mbọ debe ihe nile ị na eri ọcha Site na ị kwọ aka gị mgbe nile, i debe ihe nri ọcha na i debe onwe gi ọcha. O kwesịrị ị di gị mma tupu ụbọchị atọ mgbe ị ga aṅụcha ọgwụ a. Amara: Daalụ, dọkịta. Dọkịta: nsogbu adighị

?

Lesson Note

Lesson Exercise

    Ihe omume (Exercises)

    A. What is wrong with the following people.
    1. Ngozi (Pepto Bismuth)
    2. Okoro (Visine)
    3. Chinyere (ear drops)
    4. Nnena (Advil)
    5. Nneka (eye drops)
    6. Obi (Tylenol)
    7. Igaju (orajel)
    8. Amaka (Robotussine)
    9. Ifeoma (Icy hot)
    10. Uche ( Sudafed nasal discongestant)

    B. Ask a partner what’s wrong with him/her, when your partner responds (3 ailments), show some empathy and offer some advice.

    CH. Translate these sentences into Igbo:
    a. My feet hurts.
    b. I am going to the hospital.
    Ch. Amaka saw a doctor and he gave her medicine.
    d.Obi’s hands are swollen and he saw a doctor yesterday.
    e. I have a headache, stoma ache and diarhear.
    f. They have good health.
    g. Go, give him medicine. He has fever.
    Gb.His father has good health but his mother has bad health.
    Gh. Come, I will take show you the hospital.
    Gw. The nurse and the doctor work in the hospital.

    D. Fill in the blank spaces with the appropriate terms:
    a. Isi na …………… m ( arụ, afụ, awa)
    b. Aka na ……. M ……. (egbu, arụ, agbu, mgbu)
    ch. Afọ na ……. M (arụ, awa, afụ, eje )
    d. M ….. ụlọ ọgwụ ( gara, mụrụ, riri, loro )
    e. Anya na ……. M (alọ, egbu, esi, eri )
    f. ị chọrọ ……. ụlọ ọgwụ. (iri, ịga, ịpụ, ịgba)
    g. Amaka ……. dọkịta na …….. ( lara, hụrụ, mụrụ, ụlọ ọgwụ, ụlọ ahịa)
    gb. Ọgwụ Tylenol bụ maka …….. (afọ ọrụrụ,isi ọwụwa, anya mgbu, ntị mgbu)
    gh. Onye uwe ọcha na …….. mmadụ ……. na ụlọ ọgwụ. (enye, achọ,eri,ọgwụ,ego,nri)
    gw.Ụlọ ọgwụ bụ maka ndị …….. (ndị ohi, ndị egwu, ndị ikpe, ndị ọrịa, ndị ara.)

    Ch. Answer the following questions as they relate to you.

    1. Kedụ aha dọkita gị?
    2. Kedụ aha onye uwe ọcha gị?
    3. Kedụ ụlọ ọgwụ ị na aga?
    4. Kedụ ihe ị na eme mgbe ụkwụ gị na egbu gi mgbu?
    5. Kedụ ihe ị na eme mgbe ụkwụ gị zara aza.?
    6. Kedụ ihe ị na aṅụ mgbe afọ na arụ gị?