Unit 7 ISI NKE ISI Clara Is Nervous

Objective
Isi nke isi
Introduction

Unit 7 ISI NKE ISI Clara Is Nervous

Lesson Vocabulary

Lesson Vocabulary

Karịrị Too much
Akụkụ Next to/beside
Buluu Blue
E tu o si di….. It depends
Elu Above
Ezi na ụlọ Family
Gwa Tell
ịhụnanya Love
ịhụnanya Love
Ijekọrịta To meet
ịkpa nkata To discuss/to have a conversation
ịkpọ asị To hate
ịma jijijiji Nervous
ịnyịnya igwe Bicycle
Ka Much
Ka mfe Easier
Kachasị mfe Easiest
Mahadum University
Mfe Easy
Mmee - Mmee Red
Ngwaa Verb
Nkwadebe Ready
Nkwadebe Ready
Nnukwu Big
Nwanne Siblings
Nzukọ Meeting
Obere / ntakịrị Little bit
Obere / ntakịrị Small
Obere / ntakịrị Little
Ọcha White
Ọchị Laughter
Ọdinala Traditional
Ọgbara ọhụrụ Modern
Ọgbatumtum Motorcycle
Ọhụrụ New
Okpuru Under
Okpuru Below
Ọmarịcha Lovely
Ọsịsọ Fast
Ọtụtụ A lot of
Tupu Before
Tupu Before
Ucha Color
Ụmụnne Siblings
Ụmụnne na ụmụnna Relatives
v Black
Yi Wear

Lesson Conversation:

Mr Achebe Ụtụtụ ọma Clara! ị biara na oge na ụtụtụ a Good morning Clara! You are very early this morning.
Clara Ụtụtụ ọma, Mazị Achebe! Mụ na Sango kwesịrị ijekọrịta Good morning, Mr Achebe! I have to meet with Sango.
Mr Achebe Sango! Sango!, Onye bụ Sango? Ọ nọghị na klasị a, ọ nọ ya? Sango! Sango! Who is Sango? He is not in this class, is he?
Clara Mba, Ọ nọghị! Ọ bụ enyi m nwoke, m kwara gị maka ya No, he is not! That’s my boyfriend that I told you about.
Mr Achebe Eziokwu! Ọ bụ nwa akwụkwọ na Mahadum a?) Right! Is he a student at this university?
Clara Eeee, ọ bụ. Ọ nọ na afọ nke ikpeazụ. Tata, m ga ahụ ezi na ụlọ ya. Yes, he is. He is a senior. Today, I am going to meet his family
Mr Achebe OOO! E ji m na aka na ị di nkwadebe! ịhụ ezi na ụlọ nwoke bụ nnukwu ije na ala Igbo. Well, I hope you are ready! Meeting a boy’s family is a big step in Igbo culture.
Clara A ma m, ya mere ahụ ji ama m jijijiji. I know, that’s why I am nervous.
Mr Achebe Ọ bụkwa ya mere i ji nwe akwụkwọ nile ndi ahụ na deskị gị: akwụkwọ ọmụmụ ihe, akwụkwọ nchọta ihe okwu pụtara, akwụkwọ nkenke okwu Igbo (fres), na akwụkwọ odide ihe It must also be the reason that you have all of those books on your desk: a text book, a dictionary, an Igbo phrase Book and the class notebook?
Clara M na akwadebe onwe m! ihe nile ị kụziere anyị, ya na nkenke okwu dị mkpa) I am preparing myself! Everything you taught us, plus th important phrases.
Mr Achebe Ọ dị mma! Tupu ụmụ akwụkwọ ndi ọzọ abịa ebe a, m ga ajụ gị ihe a. ị ma ekwu nke a bụ, “ọmarịcha ezi na ụlọ”?.) Very good! Before the other students get here, let me ask you this. Do you know how to say this is a “lovely family"?
Clara M mabeghi ya! Mazị Achebe, tupu ị kwa m , m nwe ajụjụ? Ọ dị gị ka m nyara ọgbatumtum ga ụlọ Sango? Ọ dị njọ?) Not yet! Mr. Achebe, before you tell me , I have a question? Should I ride a motocycle to Sango’s house? Would it be Bad?
Mr Achebe O si na etu…..! Ụfọdụ ezi na ụlọ bụ ndị ọdinala, ndị ọzọ bụ ndị ọgbara ọhụrụ. ị kwesịrị ịjụ enyi gi nwoke! It depends! Some families are very traditional, and others are modern. You should ask your boyfriend!
Clara Anyị akpabeghị etu ezi na ụlọ ya dị, m ma na ọ hụrụ ha na anya.) We haven’t really discuss how he family is; I know that he loves them.
Mr Achebe Ọ dị mma! Ah! Pamela na - abịa! Pamela na anyakwa ọgbatumtum aga ụlọ akwụkwọ. Very good! Ah! Here comes Pamela! Pamela also rides a motorcycle to school.
Pamela ỤtụTụ ọma, Mazị Achebe! Kedụ Clara! Wow, ndị a bụ ọtụtụ akwụkwọ! Anyị na enwe ule tata? Good morning, Mr. Achebe! Hello Clara! Wow, that’s a lot of books! Are we having a test today?
Mr Achebe Ọ bụghị ule ụlọ akwụkwọ! Mana ọ bụ ule ezi na ụlọ. Clara na ezi na ụlọ enyi ya nwoke na ejekọrịta tata. Not a class test! But a family test. Clara is meeting her boyfriend’s family today
Clara Ọ na atọ ọchị, ọ na atọ nnukwu ọchị! Ka m tinye akwụkwọ ndi ahụ na okpuru deskị m tupu ndi ọzọ ebido iji m mee ihe ọchị. Funny, very funny! Let me put those books under my desk before the others come in and start making fun of me.
Pamela Ọ bụ na m nwe enyi nwoke ma ọ bụ enyi bụ onye Igbo! M gara na - asụ ọsịsọ I wish I had a boyfriend or a friend who was Igbo! I would be speaking so fast.
Clara M ma na m na amụta ọtụtụ ihe, mana ọ bụghị asụsụ na ama m ahụ jijijiji. Ọ bụ ezi na ụlọ! M kwesịrị ịhụ, ọ bụghị sọsọ nne na nna ya mana ụmụnne na ụmụnna ya nile I know that I am learning a lot; but it’s not the language that is making me so nervous. It’s the family! I have to meet not only his mother and father, but all of his siblings and relatives
Mr Achebe Ha ga - ahụ gị na anya. I ga eme nke ọma/ọfuma. Sọsọ otu ihe bụ na ị ga enwe ike kwụsị iyi akwa ojii. Anyị bụ ndị Naijiria, anyị hụ ụcha na anya. They are going to love you. You’ll do fine! The only thing, you will probably stop wearing black clothes. We, Nigerians, we love colors.
Clara M ga ebido iyi ụfọdụ ụcha, ọ bụ na okwesịghị? Mana oji na uhie ga abụrịrị ụcha abụọ m hụkarịsịrị na anya.) I will have to start wearing some colors, won’t I? But black and brown would always be my two favorite colors.
Pamela M hụ ụcha na anya. Lee, buuts m na acha mmee – mmee, panti m na acha buluu, T- sheti m na eji oji na jaketị m di ọcha na buluu dika ịnyịnya igwe m I love colors. See, my boots are red, my pants are blue, my T- shirt is black and my jacket is white and blue just like my little town bike .
Mr. Achebe Ọ dị mma! M ga ede okwu ọhụrụ ụfọdụ na ngwaa ọhụrụ na bọdụ. E ji m na aka na klasị tata ga eme ọ dị gị mfe ịhụ ezi na ụlọ Sango.) Very good! I am going to write some new words and new verbs on the board. I hope today’s class will make it easier for you to meet Sango’s family

Lesson Monologue

Usage

I go to school in the states. I am going to school at Harvard (M ga ụlọ akwụkwọ na Amerika) (M na – aga ụlọ akwụkwọ na Harvard) Where did they go? Where are they going? (Kedụ ebe ha ga?) (Kedụ ebe ha na – aga?) Did you go to Clara’s party? Are you going to Clara’s party? (ị ga oriri Clara?) (ị na- aga oriri Clara?

?

Please Note the Question and Answer Model

Kedụ ebe Clara nọ Clara nọ na ụlọ akwụkwọ Ọ na agwa Mazị Achebe okwu? Eeee, ọ na agwa Mazị Achebe okwu Ahụ, ọ na – ama Clara jijijiji? Eeee, Ahụ na – ama Clara jijijiji. Maka gịnị ka ahụ ji ama Clara jijijiji? O kwesịrị ịhụ ezi na ụlọ enyi ya nwoke. Onye bụ Pamela? Pamela bụ nwa akwụkwọ. Pamela, ọ na ahụkwu ezi na ụlọ? Mba, Pamela a naghị ahụ ezi na ụlọ Pamela, o nwe enyi bụ ndị Naijiria Mba, o nweghị. Ọ masịrị ya inwe

Where is Clara? Clara is at school. Is she talking to Mr. Achebe? Yes, she is talking to Mr. AcIs Pamela also meeting the family? No, Pamela is not meeting the family.hebe. Is Clara nervous? Yes, Clara is nervous. Why is Clara nervous? She has to meet her boyfriend’s family.Who is Pamela? Pamela is a classmate Does Pamela have Nigerian friends? No, she does not . She wishes that she did.

Lesson Note

Grammar Notes

1) To go | 2) Going

1. I go = M ga. 1. I am going = M na – aga.
2. You go = ị ga. 2. You are going = ị na – aga.
3. He/she/it goes = Ọ ga. 3. He/she/it going = Ọ na – aga.
4. We go = anyị ga. 4. We are going = Anyị na – aga.
5. You all go = Unu ga. 5. You are going = Unu na- aga.
6. They go = Ha ga 6. They are going = Ha na- aga.

1) To go | 2) Going

1. I go = M ga. 1. I am going = M na – aga. 2. You go = ị ga. 2. You are going = ị na – aga. 3. He/she/it goes = Ọ ga. 3. He/she/it going = Ọ na – aga. 4. We go = anyị ga. 4. We are going = Anyị na – aga. 5. You all go = Unu ga. 5. You are going = Unu na- aga. 6. They go = Ha ga 6. They are going = Ha na- aga.

Lesson Exercise

    Translate these sentences to Igbo.

    1. Clara is going to meet Sango’s family._________________________________________________________

    2. The students are going to school.______________________________________________________________

    3. The students’ need to go to school.______________________________________________________________

    4. My mother is about to go out.__________________________________________________________________

    5. I am going to buy a motorcycle. ________________________________________________________________

    6. The teacher is writing on the board. _____________________________________________________________

    7. The books are under the desk. __________________________________________________________________

    8. The colors are beautiful. _______________________________________________________________________

    9. Clara is Sango’s girlfriend. _____________________________________________________________________

    10. Clara is going to place her books, notebooks, and dictionary under her desk.___________________________