UNIT 8 ISI NKE ANỌ EZI NA ỤLỌ NDị IGBO (Igbo family system)

Objective
By the end of the unit, you should be able to: 1. Identify the two types of Igbo family and their members. 2. Identify the kinship terms in the Igbo family system 3. Talk about your family. 4. Use appropriate possessive pronouns
Introduction

The Igbos have two types of families. These are the nuclear family (ụmụnne) and the extended family (ụmụnna). The nuclear family is made up of the father, mother and children. This family is an adaptation from the western culture. This type of family is now more recognized and has taken precedent over the extended family among Christians, educated and city dwellers perhaps due to economic constraints. The nuclear family is what comes to mind among the Igbos at the mention of the word family(ezi na ụlọ). The extended family consists of one father, multiple mothers and children. Cousins, uncles, aunts, nieces and nephews fall under this category. The extended family still plays a dominant role especially in the rural areas as a result of the desire to keep a particular lineage. The most important feature of the Igbo family is that all children belong to the father but only the male children inherit their father. The notion being that the female children are suppose to get married and get out of the family. Members of the same family, be it nuclear or extended are believed to trace their lineage to one ancestor and as such do not marry each other. It is a taboo. There is always a close tie between the members of the nuclear family and the extended family. There is no igbo vocabulary for cousins, uncles, aunts but a simple analogy of the relationship.

Lesson Vocabulary

Lesson Vocabulary

= Nwanyị Girl/woman
= Nwanyị Girl/woman
Agadi nwanyị Old lady
Agadi nwoke Old man
Akụkọ Story
Di Husband
ịkọ akụkọ To tell a story
ịnwụọ To die
Mmekọ Relationship
Ndi si otu ezi na ụlọ Members of the same family
Nna Father
Nna di/nwunye Father in law
Nna nna paternal grandfather
Nna nne maternal grandfather
Nna nne maternal grandfather
Nne Mother
Nne di/nwunye Mother in - law
Nne nna paternal grandmother
Nne nne maternal grandmother
Nnukwu Big
Nwa Child
Nwa agbọghọ Young lady
Nwa nwanne nna Cousin
Nwa nwanne nwanyị Niece
Nwa nwanne nwoke Nephew
Nwa nwanyị daughter
Nwa nwanyị Girl
Nwa nwoke Son
Nwa nwoke Boy
Nwa okorobịa Young man
Nwanne Siblings
Nwanne nna nwanyị paternal aunt
Nwanne nna nwoke paternal uncle
Nwanne nne nwanyị Martenal aunt
Nwanne nne nwoke Maternal uncle
Nwanne nwanyị Sister
Nwanne nwanyị nnukwu Elder sister
Nwanne nwanyị obere Junior sister
Nwanne nwoke brother
Nwanne nwoke nnukwu Elder brother
Nwanne nwoke obere Junior brother
Nwanyị Female
Nwoke Boy / Man
Nwoke Man
Nwoke ọma Gentleman
Nwunye Wife
Obere/ nwa ntịntị Young/small/little
Ọgọ In-law
Ọgọ nwanyị sister in-law/mother in-law
Ọgọ nwoke brother in-law/father in-law
Okenye/Agadi Old person
Okwu dị mkpa Useful Expressions
Ụmụ Children
Ụmụ agbọghọ Young ladies
Ụmụ nwanne nna Cousins
Ụmụ nwanyị Girls
Ụmụ nwanyị Girls
Ụmụ nwoke Boys
Ụmụ okorobịa young men
Ụmụnne Siblings
Ụmụnne nwanyị Sisters
Ụmụnne nwoke Brothers

Lesson Conversation:

Nwoye and Obiọma Nwoye na Obiọma na ekwu maka ezi na ụlọ ha Nwoye and Obiọma are talking about their family

Lesson Monologue

Uju na ekwu maka ụmụnna ya. (Uju is talking about her extended family

Ndewonu. Aha m bụ Uju. M ga agwa unu maka ụmụnna m. Aha nna m bụ Nwaorie. Ọ lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha ha bụ Onyema na Udoka. Onyema bụ nwunye nke mbụ. Ọ mụrụ ụmụ asaa. Ụmụ nwanyị isii na otu nwoke. Udoka bụ nwunye nke abụọ. Ọ bụ nne m. Ọ mụrụ ụmụ ise. ụmụ nwoke anọ na otu nwanyị. Aha ụmụnna m bụ Ọba, Ojukwu, Nikem, Odera, Osadebe, Amara, Amaka, Chinelo, Nneka, Chinyere, Chidimma, Uchenna. Anyị nile bi na obodo anyị bụ Achịna. Activity 2 Using the monologue above as your guide, tell us about your extended family or any extended family that you may know.

?

Nwoye na Obiọma na ekwu maka ezi na ụlọ ha (Nwoye and Obiọma are talking about their family )

Obiọma : Nwoye, kedụ? Nwoye : Ọ dị mma. Obiọma : O teela aka, m hụbeghi gị. Nwoye : Eeee, m gara ihụ ezi na ụlọ m. Obiọma : Eziokwu. Waoo. Kedụ ka ezi na ụlọ gị dị. Nwoye : ị chọ ị ma ka ezi na ụlọ m dị ? Obiọma : Eeeeee. Nwoye : Kedụ ihe ị chọ ị ma maka ezi na ụlọ m? Obiọma : Kedụ ihe ịchọ ịgwa m? Nwoye :Gwa m ihe ị chọ ị ma. Obiọma : M chọ ị ma ihe nile. Nwoye : M ga agwa gị ihe nile. Na ezi na ụlọ m, anyị nwere mmadụ ise. Nne m, nna m na ụmụnne m abụọ. Nne m mụrụ ụmụ nwoke abụọ na otu nwanyị. Aha nne m bụ Ada. Aha nna m bụ onyema. Aha nwanne m nwoke nke nnukwu bụ ifeanyị. Aha nwanne m nwoke nke obere bụ Ibụchim. Anyị bi na Lagos. Ụmụnne m mara mma. Nne m na nna m mara mma. Anyị nwe ezigbo ezi na ụlọ. M hụ ezi na ụlọ m na anya. Kedụ maka ezi na ụlọ gị? Obioma : ezi na ụlọ m mara mma. M nwere nne na nna na otu nwanne nwanyị. Aha nne m bụ Ọlụchi. Aha nna m bụ Okoro. Aha nwanne m nwanyị bụ Ifeọma. Anyị bi na Abuja. Nwoye : Ezi na ụlọ gị mara mma. Obiọma : Daalụ.

Activity 1 : Using the dialogue above as your guide, pair up with a friend and tell each other about your family. Then, write down some aspects about your friend’s family to tell the class.

Lesson Note

Grammar Notes

Nnọchiaha Kenjuajụjụ (Interrogative Pronouns)

These pronouns are used to ask questions.
1. The personal pronouns: i, ị, o, ọ
2. The impersonal pronouns: a, e
3. Others:
a. gịnị – what
b. kedụ – what/how ch. kedụ ebe - where
d. olee – how/what/where
e . onye – who
f. nke onye – whose

Examples
I jere ebe ahụ? Did you go there?
Ị maara aha ya? Do you know his name?
O bi Lagos? Does he live in Lagos?
Ọ bia taa? Did he come today?
A hụrụ ya? Has it been seen?
E mere ya? Has it been done?
Gịnị ka i na ekwu? What are you saying?
Kedụ ebe ị na–aga? Where are you going?
Olee etu o si me? How did it happen?
Onye bia taa? Who came today?
Nke onye bu ihe a? Whose is this?

 

Nnọchingosi (demonstrative pronouns)

There are only two in igbo – “ a” and “ahụ”. The singular and the plural forms are obtained by the use of “nke” for singular and “ndị” for plural. The demonstrative pronouns are written immediately after them as follows :
Nke a = this
Nke ahụ = that
Ndi a = these
Ndi a = those

Examples :
1. Nke a bụ nne m. (This is my mother)
2. Ndi a bụ ụmụnne nna m. ( These are my uncles)
3. Nke a bụ nne nne m, nke a bụ nwanne m nwoke obere. (This is my grandmother, this is my young brother.)
4. Umụ nwanyị ndi ahụ bụ ụmụ nwanne nne m. (Those ladies are my cousins.)
5. Nkita nke ahụ bụ obere nkita m. Ọ kwa ọ mara mma? (That is my little dog. Isn’t he cute?

Note: The demonstrative pronouns (singular) can also be used alone e.g nwa a mara mma or nwoke ahụ biara but never the plural.

 

Cultural Notes

Most Common Igbo Names (Aha Igbo dị iche iche)

Males Females
1. Chiemeka 1. Chinelo
2. Ikechukwu 2. Afọma
3. Ugochukwu 3. Nneka
4. Chibueze 4. Chidimma
5. Ifeanyịchukwu 5 .Adamma
6. Nnamdi 6. Amarachi
7. Ụzọchukwu 7. Nkechinyere
8. Ụzọdimma 8. Ifeoma
9. Ndubisi 9. Ọbianuju
10. Chima 10. Chioma

Lesson Exercise

    Translate these sentences to Igbo:

    1. Clara is a young lady._______________________________________________________

    2. Mr. Achebe is a gentleman.___________________________________________________

    3. There are no boys in my school, only young men. __________________________________

    4. My mother likes to be called an old lady.__________________________________________

    5. Clara loves to tell Mr. Achebe stories._______________________________________________

     

    Translate the following into Igbo :

    1. My maternal grandfather’s name is Chima._____________________________________

    2. My brothers names are Obi and Oge.__________________________________________

    3. Clara and my mother are sisters.______________________________________________

    4. Her sister is my mother and his brother is their father._____________________________

    5. My cousins live in New York.________________________________________________

     

    Translate the following into English.

    1. Ego m bụ nke gị.___________________________________________________________

    2. akwụkwọ a bụ nke nne m.____________________________________________________

    3. Ụlọ ndi a bụ nke unu.________________________________________________________

    4. Nri ahụ bu nke anyị.__________________________________________________________

    5. Nna m na nne m nye m akwụkwọ ndị a.____________________________________________

    6. M nye ha ndị ahụ._____________________________________________________________

    7. Clara bụ nwanne m._____________________________________________________________

    8. Onye bụ nne nne ha._____________________________________________________________

    9. Sango nye Clara akpa akwụkwọ ndi a.______________________________________________

    10. Anyị bụ ụmụnne ha.____________________________________________________________